19 M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru:
20 ka ha we jegharia n'ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.
21 Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
22 Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu.
23 Ebube Jehova we si n'etiti obodo ahu rigo, guzo n'elu ugwu ahu nke di n'akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu.
24 Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo.
25 M'we gwa ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ ihe nile nke Jehova mere ka m'hu.