12 M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.
13 Ewe ke gi ihe-ichọ-nma nke ọla-edo na ọla-ọcha; uwe-oyiyi-gi bu kwa ezi ákwà ọcha na nkisi na uwe akpara nke-ọma; utu ọka flour na manu-aṅu na manu ka i riri: i we mab͕ue onwe-gi na nma, o we gara gi nke-ọma, i we rue ala-eze.
14 Aha i nwere we pua ba n'etiti mba nile n'ihi nma-gi; n'ihi na ihe zuru okè ka ọ bu, n'ihi ima-nmam nke M'tukwasiri gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15 I we tukwasi nma-gi obi, kwa iko n'ihi aha-gi, wukwasi ikwa-iko-gi nile n'aru onye ọ bula nāgabiga; nke ya ka ọ bu.
16 I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.
17 I we chiri ihe-gi nile mara nma nke sitere n'ọla-edom na n'ọla-ọcham, nke M'nyere gi, i we mere onwe-gi onyinyo di iche iche nke nwoke, kwaso ha iko,
18 chiri uwe-gi nke akpara nke-ọma, kpuchie ha, ọ bu kwa manum na ihe-nsure-ọkum nēsì ísì utọ ka i chere n'iru ha.