22 Ma n'ihe-árú-gi nile na ikwa-iko-gi nile i chetaghi ubọchi nile mb͕e i di na nwata, mb͕e i b͕asiri ọtọ, onye anāzọtọ n'ọbara-gi ka i bu kwa.
23 O rue, mb͕e ihe ọjọ gi nile gasiri, (ahuhu, ahuhu diri gi! ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta,)
24 na i wuworo onwe-gi ulo ikwa iko, me-kwa-ra onwe-gi ebe di elu n'amá nile ọ bula.
25 N'isi-uzọ nile ọ bula ka i wuworo ebe-gi di elu, i we me ka nma-gi ghọ ihe-árú, i we ghebere onye-ngabiga ọ bula ukwu-gi abua, me ka ikwa-iko-gi ba uba.
26 I we kwaso umu Ijipt, bú ndi-ab͕ata-obi-gi, ndi anu-aru-ha di uku, iko, me ka ikwa-iko-gi ba uba, ikpasum iwe.
27 Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.
28 I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.