3 O we zùputa otù n'umu-ya; nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.
4 Mba di iche iche we nu ihe bayere ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya: ha ji nb͕a-aka-imi me ka ọ biarue ala Ijipt.
5 Nne-ọdum ahu we hu na o chereri, ma na olile-anya-ya alawo n'iyì, o we were otù ọzọ n'umu-ya, me ya nwa-ọdum.
6 Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.
7 O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya.
8 Mba nile we si n'ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n'aru ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya.
9 Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.