6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
7 I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.
8 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi.
9 M'we hu, ma, le, otù aka nke esetipuru nyem; ma, le, nime ya ka akwukwọ-npiakọta di;
10 O we b͕asa ya n'irum; ma edere ya-ri ihe n'iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.