19 Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; jegharianu n'ukpurum nile, debe-kwa-nu ikpém nile, me ha:
20 donu ubọchi-izu-ikem nile nsọ; ha gāghọ kwa ihe-iriba-ama n'etiti Mu na unu, ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
21 Umu-ha we nupu isi n'okpurum; ha ejeghi ije n'ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'ọzara.
22 Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.
23 Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n'ọzara, si, na M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile;
24 n'ihi na ha emeghi ihem nile ekpere n'ikpe, ọ bu kwa ukpurum nile ka ha juru, ubọchi-izu-ikem nile ka ha me-kwa-ra ka ha ghara idi nsọ, ọ bu kwa n'iso arusi nile nke ndi bu nna-ha ka anya-ha di.
25 Ọzọ, enye-kwa-ram ha ukpuru di iche iche nke nādighi nma, na ikpe di iche iche nke ha nāgaghi-adi ndu nime ha;