28 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:
29 mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.
30 Mighachi ya n'ọbọ́-ya. N'ebe ekère gi, n'ala nputa-uwa-gi, ka M'gēkpe gi ikpe.
31 M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.
32 I gāghọrọ ọku nri; ọbara-gi gādi n'etiti ala-gi; agaghi-echeta gi: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.