3 si ala Israel, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, M'gāmiputa kwa mma-agham n'ọbọ-ya, bipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu.
4 Ebe M'gēbipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'ihi nka ka mma-agham gēsi n'ọbọ-ya puta imegide anu-aru nile, bú madu, site na Ndida rue Ugwu:
5 anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.
6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ze ume; na nb͕aji úkwù na n'ilu obi ka i gēze ume n'anya-ha.
7 Ma ọ gēru, mb͕e ha gāsi gi, N'ìhi gini ka gi onwe-gi nēze ume? na i gāsi, Ọ bu n'ihi akukọ, n'ihi na ọ nābia: obi nile ọ bula gālọ kwa miri, aka nile gākuda, ike gāgwu mọ madu nile ọ bula, ikperè-ukwu nile gāghọ miri miri: le, ọ nābia, o ruwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
8 Okwu Jehova we ruem nti, si,
9 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Jehova siri: Si, Le, mma-agha, le, mma-agha, amuru ya amu, ọ bu kwa ihe emere ka ọ nēb͕u maramara: