11 Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.
12 Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
13 Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.
14 Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.
15 M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.
16 Agēme kwa ka i ghara idi nsọ n'onwe-gi, n'anya mba nile; i we mara na Mu onwem bu Jehova.
17 Okwu Jehova we ruem nti, si,