1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:
3 si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:
4 n'ihi nka, le, M'gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi.
5 M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
6 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;