12 Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.
13 M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.
14 M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?
16 Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.
17 Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!
18 Ub͕u a ka agwe-etiti gāma jijiji n'ubọchi ọdida-gi; e, ibobo gānwu agwe-etiti nile nke di n'oké osimiri n'aru n'ọpupu-gi.