33 Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n'oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya.
34 Na mb͕e etiwara gi site n'oké osimiri nile n'ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n'etiti gi.
35 I juwo ndi nile bi n'agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo.
36 Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.