5 Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o.
6 Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.
7 Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.
8 Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.
9 Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.
10 Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.
11 Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.