1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:
3 le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi:
4 i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n'àkù-gi nile: