1 O we sim, Nwa nke madu, ihe ahu nke i nāhu, rie ya; rie akwukwọ-npiakọta ahu, je, gwa ulo Israel okwu.
2 M'we saghepu ọnum, O we me ka m'rie akwukwọ-npiakọta ahu.
3 O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n'akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M'we rie; o we di n'ọnum dika manu-aṅu n'utọ.
4 O we sim, Nwa nke madu, je, ba n'ulo Israel, were okwum nile gwa ha.
5 N'ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel;
6 ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti.
7 Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.