28 Ma gi onwe-gi, n'etiti ndi anēbighi úgwù ka agētipia gi, i gēso kwa ndi ejiri mma-agha b͕u dina.
29 N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina.
30 N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
31 Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
32 N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.