25 N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?
26 Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?
27 Otú a ka i gāsi ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ndi nọ na nkpọnkpọ ebe nile gāda site na mma-agha, M'gēwere kwa onye nọ n'ọhia nye anu-ọhia ka ewe ripia ya, na ndi nọ n'ebe nile ewusiri ike na n'ọb͕à nile, n'ajọ ọria nēfe efe ka ha gānwu.
28 M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.
29 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri ala-ha ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, n'ihi ihe-árú nile ha nke ha meworo.
30 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, umu ndi-gi ndi nēkwu okwu bayere gi n'akuku mb͕idi nile ha, na n'ọnu-uzọ nile nke ulo nile ha, ha agwaritawo onwe-ha okwu, onye ọ bula ọ gwa nwa-nne-ya, si, Biko, bianu, nuru ihe bu okwu a nke nēsi n'ọnu Jehova puta.
31 Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.