6 Ìgwè ewu na aturu nkem nākpafu n'ugwu nile, na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu: ọ bu kwa n'elu uwa nile ka ìgwè ewu na aturu nkem b͕asara: ọ dighi kwa onye nāju ajuju bayere ha, ọ dighi kwa onye nāchọ ha.
7 N'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova:
8 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n'agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n'ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi;
9 n'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova;
10 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.
11 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, M'gāchọ kwa ìgwè ewu na aturu nkem, chọputa ha.
12 Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n'ubọchi ọ nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M'gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M'gānaputa kwa ha n'ebe nile ha b͕asara n'ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri.