19 M'we chusa ha n'etiti mba nile, ha we b͕asa n'ala nile: dika uzọ-ha si di, na dika omume nile ha si di, otú a ka M'kpere ha ikpe.
20 Ha we biarue mba nile ebe ha biara, ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ; mb͕e anēkwu okwu bayere ha, si, Ndi nke Jehova ka ndia bu, ọ bu kwa n'ala-Ya ka ha siri puta.
21 Ma enwerem ọmiko n'aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, ebe ha biara.
22 N'ihi nka si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bughi n'ihi unu ka Mu onwem nālu ọlu, unu ulo Israel, kama ọ bu n'ihi aha nsọm, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile ebe unu biara.
23 M'gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n'anya-ha.
24 M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu.
25 M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.