7 M'we bue amuma dika esiri nyem iwu: otù olu we da mb͕e m'nēbu amuma, ma, le, ime-nkpatu di, ọkpukpu we biarute onwe-ha nso, ọkpukpu n'ọkpukpu nke ya.
8 M'we hu, ma, le, akwara dikwasi ha, anu-aru rigota-kwa-ra, akpukpọ-aru we kpuchie ha n'elu: ma ume adighi nime ha.
9 O we sim, Buere ifufe amuma, bue amuma, nwa nke madu, si ifufe, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Si n'ifufe anọ bia, gi ume, kukwasi ndia eb͕uru eb͕u ume, ka ha we di ndu.
10 M'we bue amuma dika O nyerem iwu, ume we ba nime ha, ha we di ndu, guzo ọtọ n'ukwu-ha, buru oké usu-ndi-agha di uku ri nne.
11 O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.
12 N'ihi nka bue amuma, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gēmeghe ílì nile unu, me ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim; M'gēme kwa ka unu bata n'ala Israel.
13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'meghesiri ílì-unu, na mb͕e M'mesiri ka unu si n'ílì-unu rigoputa, unu ndim.