Ezikiel 38:11-17 IGBOB

11 i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere:

12 ikwata ihe-nkwata na iluta ihe-nluta n'agha; ichighari aka-gi imegide nkpọnkpọ ebe nke madu bi nime ha ub͕u a, na imegide otù ndi nke achikọputaworo na mba di iche iche, nke lutaworo anu-ulo na ihe-ahia n'ọlu, ndi bi n'elu-ala nke uwa.

13 Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?

14 N'ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya?

15 I gēsi kwa n'ebe-gi, n'akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba:

16 i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.

17 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?