3 M'gētipu kwa uta-gi n'aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n'aka-nri-gi.
4 N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.
5 N'ọhia ka i gāda: n'ihi na Mu onwem ekwuwo, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
6 M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7 Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.
8 Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya.
9 Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa: