6 M'gēziga ọku n'aru Megog na n'aru ndi bi n'agwe-etiti nile na ntukwasi-obi: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7 Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.
8 Le, ọ nābia, ọ gēme kwa, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta); nka bu ubọchi ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya.
9 Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:
10 ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
11 O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.
12 Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.