1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n'iru gi, kà otù obodo n'elu ya, bú Jerusalem:
2 tiye ihe-nnọchigide-n'agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu.
3 Gi onwe-gi were kwa n'onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n'agha, i gānọchigide kwa ya n'agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel.
4 Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha.