9 Ọzọ, gi onwe-gi were n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n'otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya.
10 Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya.
11 Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n'uzọ iri nke otù hin: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya.
12 Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n'anya-ha.
13 Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n'etiti mba nile ebe M'gāchuga ha.
14 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum.
15 O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya.