10 N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.
11 Uzọ nke di n'iru ha di kwa ka uzọ nke ime-ulo nke di n'uzọ Ugwu si di n'ile ha anya; dika ogologo-ha si di, otú a ka obosara-ha di: ọpùpù nile ha di ka ikpé nile ha si di, na dika ọnu-uzọ nile ha si di.
12 Ma dika ọnu-uzọ nile nke ime-ulo nile si di nke di n'uzọ Ndida, otú a ka otù ọnu-uzọ si di nke di n'isi uzọ, bú uzọ nke di n'iru mb͕idi n'uzọ Iru-anyanwu, ebe anābà nime ha.
13 O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.
14 Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.
15 Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile.
16 O were ami ahu o ji atù ihe tùa akuku Iru-anyanwu nnù ami na ọgu ise, o were ami ahu o ji atù ihe tùa ya buruburu.