3 Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ.
4 N'iru ime-ulo nile ka otù uzọ-njeghari di, nke di cubit iri n'obosara n'ime, ọ bu uzọ nke di otù cubit: ọnu-uzọ nile ha chere iru n'Ugwu.
5 Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu.
6 N'ihi na okpukpu atọ ka ha di, ha enweghi kwa ogidi dika ogidi nke ogige abua ahu: n'ihi nka emere ka ime-ulo nke kachasi elu di nkpa kari nke di ala na nke etiti site n'ala.
7 Ma mb͕idi nke di n'èzí n'akuku ime-ulo nile, n'uzọ ogige di n'èzí n'iru ime-ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit abua na iri.
8 N'ihi na ogologo nke ime-ulo nke diri ogige di n'èzí di ọgu cubit abua na iri: ma, le, n'iru ulo uku Chineke ọ di ọgu cubit ise.
9 Site kwa n'okpuru ime-ulo ndia ka nbata di n'akuku Iru-anyanwu, ebe anēsi n'ogige di n'èzí abata nime ha.