2 ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.
3 Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala.
4 Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu.
5 Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.
6 M'we nu olu otù onye nāgwam okwu site n'ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n'akukum.
7 O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;
8 mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.