18 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.
19 Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.
20 Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.
21 N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.
22 Onye-isi gēdozi kwa n'ubọchi ahu otù oke-ehi n'ọnọdu onwe-ya na n'ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie.
23 N'ubọchi asa nke ememe ahu ọ ganēdozi àjà-nsure-ọku ichuru Jehova, bú oke-ehi asa na ebulu asa nke zuru okè, kwa-ubọchi n'ubọchi asa ahu; na àjà-nmehie, bú otù nkpi, kwa-ubọchi.
24 Onyinye-inata-iru-ọma ka ọ gēdozi kwa, bú otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, otù hin nke manu di-kwa-ra otù ephah.