8 O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.
9 Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n'ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n'ihi na miri ndia eruwo n'ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n'ebe osimiri ahu gērute.
10 Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.
11 Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye.
12 Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.
13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Nka gābu ókè-ala, nke unu gēsi ketara onwe-unu ala nka dika ebo iri na abua nke Israel si di: Josef gēnweta òkè ala di iche iche.
14 Unu gēketa kwa ya, otù onye dika nwa-nne-ya; n'ihi na ewelirim akam inye ya nna-unu-hà: ala nka gādaye n'aka-unu n'ihe-nketa.