Ezikiel 48:8-14 IGBOB

8 Ma n'akuku ókè-ala Juda, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu, ka àjà-nbuli nke unu gēbuli gādi, orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri bu obosara-ya, ogologo-ya gādi kwa ka otù nime òkè ndia, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu: ebe nsọ Chineke gādi kwa n'etiti ya.

9 Àjà-nbuli ahu nke unu gēbuliri Jehova, ogologo-ya gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara-ya gādi kwa orú nnù ami na nnù ise.

10 Ọ bu kwa ndia, bú ndi-nchu-àjà, gēnwe àjà-nbuli nsọ ahu; n'akuku Ugwu orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, n'akuku Ọdida-anyanwu obosara-ya di orú nnù na nnù ise, n'akuku Iru-anyanwu obosara-ya di orú nnù ise, n'akuku Ndida ogologo-ya di orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri: ebe nsọ nke Jehova gādi kwa n'etiti ya.

11 Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru.

12 Ọ gābu-kwa-ra ha àjà-nbuli sitere n'àjà-nbuli nke ala nka, ihe di nsọ kachasi ihe nsọ nile, n'ókè-ala ndi Livai.

13 Ma n'akuku ókè-ala ndi-nchu-àjà, ka ndi Livai gēnwe orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi orú nnù na nnù ise. Ogologo nile gādi orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara gādi kwa orú nnù na nnù ise.

14 Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n'ebe ọzọ: n'ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova.