Ezikiel 5:11-17 IGBOB

11 N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.

12 Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.

13 Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.

14 Ọzọ, M'gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n'etiti mba nile nke di gi buruburu, n'anya onye ọ bula nke nāgabiga.

15 Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:

16 mb͕e M'gēziga àkú ọjọ nile nke oké unwu n'etiti ha, bú àkú nke diri nbibi, nke M'gēziga ibibi unu; ọ bu kwa oké unwu ka M'gātukwasiri unu, M'we b͕ajiere unu nkpa-n'aka, bú achicha;

17 M'gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n'etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.