13 Ndia ka unu gāgu kwa n'ihe-árú n'etiti anu-ufe; agaghi-eri ha, ihe-árú ka ha bu: ugo, na ego-agwọ, na ugo-azù;
14 na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche;
15 ugolo-ọma ọ bula di iche iche;
16 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche;
17 na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku;
18 na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele;
19 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu.