Levitikọs 9 IGBOB

1 O rue, n'ubọchi nke-asatọ, na Moses kpọrọ Eron na umu-ya ndikom, na ndi-okenye Israel;

2 ọ si Eron, Were n'onwe-gi nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku, nke zuru okè ka ha gābu, gi weta kwa ha nso n'iru Jehova.

3 Umu Israel ka i gāgwa kwa okwu, si, Werenu nkpi ka ọ buru àjà-nmehie; na nwa-ehi na nwa-aturu, ha abua gāb͕a otù arọ, bú nke zuru okè, ka ha buru àjà-nsure-ọku;

4 chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n'iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n'ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya.

5 Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova.

6 Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka unu me: agēme kwa ka unu hu ebube Jehova anya.

7 Moses we si Eron, Biarue ebe-ichu-àjà nso, me àjà-nmehie-gi, na àjà-nsure-ọku-gi, kpuchiere onwe-gi, kpuchi-kwa-ra ndi Israel, nmehie-unu; me kwa onyinye iji biaru nso nke ndi ahu, kpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha; dika Jehova nyere iwu.

8 Eron we biarue ebe-ichu-àjà nso, b͕ue nwa-ehi nke àjà-nmehie nke diri ya onwe-ya.

9 Umu-ndikom Eron we wetara ya nso ọbara-ya: ọ we deye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà, we wusi ọbara na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

10 ma abuba, na akọrọ abua, na mba-imeju nke putara n'imeju, nke si n'àjà-nmehie puta, o surere ha ọku ibu ihe-nsure ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

11 Ma anu-ya na akpukpọ-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

12 Ọ we b͕ue ihe àjà-nsure-ọku: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.

13 Àjà-nsure-ọku ka ha me-kwa-ra ka o rue ya aka, n'ọbubọ, na isi-ya; ọ we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.

14 Ọ we sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà.

15 Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.

16 Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di.

17 Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.

18 O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu,

19 ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n'ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n'ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju:

20 ha we tukwasi abuba ahu n'okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'ebe-ichu-àjà:

21 ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; dika Moses nyere iwu.

22 Eron we chilie aka-ya n'ebe ndi Israel nọ, gọzie ha; o si n'ime àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku na àjà-udo rida.

23 Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.

24 Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27