Levitikọs 8 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;

3 kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

4 Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

5 Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya.

6 Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.

7 O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.

8 Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.

9 Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

10 Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ.

11 Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.

12 Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.

13 Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.

14 Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie.

15 O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.

16 Ọ were abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.

17 Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.

18 Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

19 O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

20 Ọ bọ ebulu ahu n'ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

21 Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22 Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

23 O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.

24 Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu.

25 Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:

26 o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri:

27 o tiye ha nile n'elu ọbu-aka abua nke Eron, na n'elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.

28 Moses we wepu ha n'elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

29 Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.

30 Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya.

31 Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m'nyere n'iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya.

32 Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n'ọku ka unu gēsure ya.

33 Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n'ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu.

34 Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.

35 Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.

36 Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27