Levitikọs 13 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2 Madu, mb͕e ihe-otutó, ma-ọbu ọnyá, ma-ọbu ntupọ nke nēke uke, di n'akpukpọ nke anu-aru-ya, mb͕e ihe ahu gāghọ n'akpukpọ nke anu-aru-ya ihe-otiti ekpenta, agēme kwa ka ọ biakute Eron, bú onye-nchu-àjà, ma-ọbu biakute otù nime umu-ya ndikom, bú ndi-nchu-àjà:

3 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu di n'akpukpọ nke anu-aru-ya: ma ọ buru na aji nke di n'ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọchā, ọ buru kwa na, n'ile ihe-otiti ahu anya, ọ di omimi kari akpukpọ anu-aru-ya, ihe-otiti ekpenta ka ọ bu: onye-nchu-aja gāhu kwa ya, si na ọ ruru árú.

4 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke di ọcha n'akpukpọ anu-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji-ya abanweghi ọcha, onye-nchu-àjà gēme-chibido onye nwere ihe-otiti ahu nime ulo abali asa:

5 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya anya n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu eguzo n'anya-ya, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

6 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa ọzọ: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, ma ihe-otiti ahu abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha; ọnyá efu ka ọ bu; ọ gāsu kwa uwe-ya, di ọcha.

7 Ma ọ buru na ọnya ahu aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e emesiri ka onye-nchu-àjà hu ya ime ka ọ di ọcha, ọ gēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya nke ub͕ò abua:

8 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọnyá ahu abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi na ọ ruru árú: ekpenta ka ọ bu.

9 Mb͕e ihe-otiti ekpenta di n'aru madu, agēme kwa ka ọ biakute onye-nchu-àjà;

10 onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na ihe-otutó ọcha di n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ihe ahu emewo aji ka ọ b͕anwe ọcha, onyá nke anu-aru ndu adi kwa n'ihe-otutó ahu,

11 ekpenta site na mb͕e ochie ka ọ bu n'akpukpọ anu-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọ gaghi-emechibido ya nime ulo; n'ihi na onye ruru árú ka ọ bu.

12 Ọ buru kwa na ekpenta ab͕awaputa nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, ekpenta ahu ewe kpuchie akpukpọ-aru nile nke onye nwere ihe-otiti ahu site n'isi-ya we rue ukwu-ala-ya, ọbuná ihe nile anya onye-nchu-àjà nāhu;

13 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ekpenta ekpuchiwo anu-aru-ya nile, ọ gāsi kwa na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: aru-ya nile ab͕anwewo ọcha: ọcha ka ọ di.

14 Ma n'ubọchi anāhu anu-aru ndu nime ya, ọ gāru árú.

15 Onye-nchu-àjà gāhu kwa anu-aru ndu ahu, si na ọ ruru árú: anu-aru ndu ahu, ihe ruru árú ka ọ bu: ekpenta ka ọ bu.

16 Ma-ọbu mb͕e anu-aru ndu ahu gātughari, b͕anwe ọcha, ọ gābiakute kwa onye-nchu-àjà,

17 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anwewo ọcha, onye-nchu-àjà gāsi na onye nwere ihe-otiti ahu di ọcha: ọcha ka ọ di.

18 Ọzọ, anu-aru, mb͕e ihe-ofifi di nime ya n'akpukpọ-aru-ya, ma eme ka ọ la.

19 ihe-otutó ọcha we di n'ọnọdu ihe otiti ahu, ma-ọbu ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, agēme ka onye-nchu-àjà hu ya;

20 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya, ma, le, ọ buru na ọ di ala, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji-ya ab͕anwewo kwa ọcha, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, n'ihe-ofifi ahu ka ọ b͕awaputaworo.

21 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ya, ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi, onye-nchu-àjà gēmechibido ya nime ulo ubọchi asa;

22 ma ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ka ọ bu.

23 Ma ọ buru na ntupọ ahu nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya, ma ọ baghi aba, apa ihe-ofifi ahu ka ọ bu; onye-nchu-àjà gāsi na ọ di ọcha.

24 Ma-ọbu anu-aru, mb͕e ọku-ọruru di n'akpukpọ-aru-ya, mb͕e anu-aru ndu nke ọku-ọruru ahu gāghọ ntupọ nēke uke, nke di ọcha nācha ọbara-ọbara, ma-ọbu ọcha;

25 onye-nchu-àjà gāhu ya: ma, le, ọ buru na aji ab͕anwewo ọcha nime ntupọ ahu nēke uke, ọ di kwa omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; ekpenta ka ọ bu, n'ọku-ọruru ahu ka ọ b͕awaputaworo: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

26 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú ya, ma, le, aji ọcha adighi nime ntupọ ahu nēke uke ọ dighi kwa ala kari akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; onye-nchu-àjà gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa:

27 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya n'ubọchi nke-asa: ọ buru na ọ ba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ihe-otiti ekpenta ka ọ bu.

28 Ma ọ buru na ntupọ nke nēke uke eguzo n'ọnọdu-ya ma ọ baghi aba n'akpukpọ-aru-ya, kama ihe ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi; ihe-otutó nke ọku-ọruru ahu ka ọ bu, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: n'ihi na apa ọku-ọruru ahu ka ọ bu.

29 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ihe-otiti di n'aru-ya, n'isi ma-ọbu n'afu-ọnu,

30 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu: ma, le ọ, buru na ọ di omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na aji nācha edo edo, nke di irighiri, di nime ya, onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ ruru árú: ọria isi ka ọ bu, ekpenta nke isi ma-ọbu nke afu-ọnu ka ọ bu.

31 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti nke ọria-isi ahu, ma, le, ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya, aji oji adighi kwa nime ya, onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ihe-otiti ọria-isi ahu nime ulo ubọchi asa:

32 onye-nchu-àjà gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi ahu abaghi aba, ọ buru kwa na aji nke nācha edo edo adighi nime ya, ọ buru kwa na ọria-isi ahu adighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya,

33 agākọpu kwa isi-ya, ma, ọ gaghi-akọpu ọria-isi ahu: onye-nchu-àjà gēmechibido kwa onye nwere ọria-isi ahu ubọchi asa ọzọ:

34 onye-nchu-àjà gāhu kwa ọria-isi ahu n'ubọchi nke-asa: ma, le, ọ buru na ọria-isi abaghi aba n'akpukpọ-aru-ya, ọ buru kwa na ọ dighi omimi, n'ile ya anya, kari akpukpọ-aru-ya; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, di ọcha.

35 Ma ọ buru na ọria-isi-ya aba aba nke-uku n'akpukpọ-aru-ya mb͕e emesiri ka ọ di ọcha;

36 onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ọria-isi abawo aba n'akpukpọ-aru-ya, onye-nchu-àjà agaghi-achọ aji nācha edo edo ahu; onye ruru árú ka ọ bu.

37 Ma ọ buru na ọria-isi ahu eguzowo n'anya-ya, ọ buru kwa na aji oji epuputawo nime ya; emewo ka ọria-isi ahu la, ọcha ka ọ di: onye-nchu-àjà gāsi kwa na ọ di ọcha.

38 Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ntupọ di iche iche nke nēke uke, bú ntupọ nēke uke nke di ọcha, di n'akpukpọ anu-aru-ha;

39 onye-nchu-àjà gāhu kwa: ma, le, ọ buru na ntupọ di iche iche nke nēke uke acha ọcha inyoghi-inyoghi, bú nke di n'akpukpọ anu-aru-ha; ngwọ ka ọ bu, ọ b͕awa-putawo n'akpukpọ-aru-ya; ocha ka ọ di.

40 Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n'isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di.

41 Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n'isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di.

42 Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n'isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n'egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n'isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu.

43 Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya;

44 onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.

45 Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.

46 Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.

47 Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;

48 ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:

49 ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:

50 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa:

51 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n'uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu.

52 O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.

53 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula;

54 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

55 onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.

56 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie.

57 Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya.

58 Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27