Levitikọs 14 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Nka gābu iwu onye-ekpenta n'ubọchi anēme ya ka ọ di ọcha: na agēme ya ka ọ biakute onye-nchu-àjà:

3 onye-nchu-àjà gāpu kwa je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: onye-nchu-àjà gāhu kwa, ma, le, ọ buru na emewo ka ihe-otiti ekpenta si n'aru onye-ekpenta ahu la;

4 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ewere nnunu abua di ndu di kwa ọcha, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, bayere onye anēme ka ọ di ọcha:

5 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka eb͕ue otù nime nnunu ahu nime ihe ájá n'elu miri nērù erù:

6 nnunu ahu nke di ndu, o gēwere ya, na osisi cedar ahu, na ogho uhie ahu, na hyssop ahu, sue ha na nnunu ahu di ndu n'ọbara nnunu ahu eb͕uru n'elu miri nērù erù:

7 ọ gēfesa kwa ya ub͕ò asa n'aru onye-ahu anēme ka ọ di ọcha n'ekpenta, ọ gāsi kwa na ọ di ọcha, o gēzilaga kwa nnunu ahu di ndu nime ọhia sara iru.

8 Onye ahu anēme ka ọ di ọcha gāsu kwa uwe-ya nile, kọpu kwa aji-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gādi kwa ọcha: emesi kwa ọ gābata nime ọmuma-ulo-ikwū, ma ọ gānọdu n'ezí ulo-ikwū-ya ubọchi asa.

9 O gēru kwa n'ubọchi nke-asa, na ọ gākọpu aji-ya nile, bú agiri-isi-ya, na afu-ọnu-ya, na iku-anya-ya, ọbuná aji-ya nile ka ọ gākọpu: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, ọ gādi kwa ọcha.

10 Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere umu-ebulu abua zuru okè, na otù nwa-aturu zuru okè nke bu nne, nke b͕ara otù arọ, na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, na otù log nke manu.

11 Onye-nchu-àjà nke nēme ya ka ọ di ọcha gēguzo kwa nwoke ahu anēme ka ọ di ọcha, na ihe ahu di iche iche, n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu:

12 onye-nchu-àjà gēwere kwa otù nime umu-ebulu ahu, weta ya nso ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ya na log nke manu ahu, ọ gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:

13 o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu:

14 onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-àjà gētiye kwa ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka nri ya:

15 onye-nchu-àjà gēweta kwa ufọdu nime log nke manu ahu, wusi ya n'ọbu-aka-ekpe nke onye-nchu-àjà ahu:

16 onye-nchu-àjà gēdeye kwa nkpisi-aka-nri-ya nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya, ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime manu ahu ub͕ò asa n'iru Jehova:

17 ufọdu nime manu nke fọduru n'ọbu-aka-ya ka onye-nchu-àjà gētiye kwa n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye ahu anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ọbara àjà-ikpe-ọmuma:

18 ma manu nke fọduru n'ọbu-aka nke onye-nchu-àjà, o gētiye ya n'isi onye anēme ka ọ di ọcha: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova.

19 Onye-nchu-àjà gēme kwa àjà-nmehie, kpuchiere ya nmehie-ya, bú onye anēme ka o si n'ọrurú-ya di ọcha; emesia o gēb͕u kwa àjà-nsure-ọku:

20 onye-nchu-àjà gēsure kwa àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma n'ebe-ichu-aja: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, ọ gādi kwa ọcha.

21 Ma ọ buru na ob͕eye ka ọ bu, nke aka-ya nērughi kwa ya, o gēwere kwa otù nwa-ebulu ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma ibu àjà-ofufè, ikpuchiri ya nmehie-ya, na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara manu ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma, na otù log nke manu;

22 na nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, nke aka-ya ruru; otù gābu kwa àjà-nmehie, ibe-ya gābu àjà-nsure-ọku.

23 Ọ gēweta-kwa-ra ha onye-nchu-aja n'ubọchi nke-asatọ ime ka ọ di ọcha, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, n'iru Jehova.

24 Onye-nchu-aja gēwere kwa nwa-aturu ahu nke àjà-ikpe-ọmuma, na log manu ahu, onye-nchu-aja gēfé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova:

25 o gēb͕u kwa nwa-aturu àjà-ikpe-ọmuma ahu, onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu, tiye ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya:

26 ọ bu kwa ufọdu nime manu ahu ka onye-nchu-aja gāwusi n'ọbu-aka-ekpe onye-nchu-aja ahu:

27 onye-nchu-aja gēwere kwa nkpisi-aka-nri-ya fesa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ekpe-ya ub͕ò asa n'iru Jehova:

28 onye-nchu-aja gētiye kwa ufọdu nime manu nke di n'ọbu-aka-ya n'ọnu-ọnu nti aka-nri nke onye anēme ka ọ di ọcha, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya, n'elu ebe ọbara àjà-ikpe-ọmuma ahu:

29 ma nke fọduru nime manu nke di n'ọbu-aka onye-nchu-aja, o gētiye ya n'elu isi onye anēme ka ọ di ọcha, ikpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova.

30 Ọ gāchu kwa otù nime nduru ahu n'àjà, ma-ọbu nime umu-kpalakwukwu ahu, nime ihe aka-ya ruru;

31 ọbuná ihe aka-ya ruru, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu onyinye-inata-iru-ọma: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, bú onye anēme ka ọ di ọcha n'iru Jehova.

32 Nka bu iwu nke onye ahu ihe-otiti ekpenta di n'aru ya, onye aka-ya nērughi n'ihe ime ya ka ọ di ọcha.

33 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

34 Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu;

35 onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m'hu ihe dika ihe-otiti n'ulo:

36 onye-nchu-aja gēnye kwa iwu ka akwapu ihe di n'ulo ahu, tutu onye-nchu-àjà abà nime ihu ihe-otiti ahu, ka aghara ime ka ihe nile nke di n'ulo ru árú: emesia onye-nchu-àjà gābà kwa ihu ulo ahu:

37 ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n'ile anya;

38 onye-nchu-àjà gēsi kwa n'ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa:

39 onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo;

40 onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

41 ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú:

42 ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu.

43 Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya;

44 onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n'ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n'ulo: ihe ruru árú ka ọ bu

45 Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n'azu obodo, n'ebe ruru árú.

46 Ọzọ, onye nābà n'ulo ahu ubọchi nile o mechiri ya gāru árú rue anyasi.

47 Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile.

48 Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la.

49 Ọ gēwere kwa nnunu abua, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, iwepu nmehie n'ulo ahu:

50 ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n'ihe ájá n'elu miri nērù erù:

51 ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa:

52 Ọ gēwepu kwa nmehie n'ulo ahu site n'ọbara nnunu ahu, site kwa na miri ahu nērù erù, site kwa na nnunu ahu di ndu, site kwa n'osisi cedar ahu, site kwa na hyssop ahu, site kwa n'ogho uhie ahu:

53 ma ọ gēzilaga nnunu ahu di ndu n'azu obodo n'ọhia sara iru: ọ gēkpuchi-kwa-ra ulo ahu nmehie-ya: ọ gādi kwa ọcha.

54 Nka bu iwu diri ihe-otiti ekpenta ọ bula, di-kwa-ra ọria-isi;

55 di-kwa-ra ekpenta uwe, di-kwa-ra ulo;

56 di-kwa-ra ihe-otutó, di-kwa-ra ọnyá, di-kwa-ra ntupọ nēke uke:

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27