Levitikọs 22 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

3 Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'irum: Mu onwem bu Jehova.

4 Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua;

5 ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n'ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n'ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula;

6 madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri.

7 Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n'ihi na nri-ya ka ọ bu.

8 Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova.

9 Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

10 Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.

11 Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n'ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya.

12 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.

13 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.

14 Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n'amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzo ise ya n'elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu.

15 Ha agaghi-eme kwa ka ihe nsọ nke umu Israel ghara idi nsọ, bú nke ha nēbuliri Jehova;

16 ha we ghara ime ka ha nēbu ajọ omume nke ikpe-ọmuma, mb͕e ha nēri ihe nsọ ha: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

17 Jehova we gwa Moses okwu, si,

18 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;

19 unu gēweta nso oké nke zuru okè n'etiti ìgwè ehi, ma-ọbu n'etiti aturu, ma-ọbu n'etiti ewu, ka unu we buru ihe nātọ utọ.

20 Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

21 Ọzọ mb͕e onye ọ bula nēweta nso Jehova ihe àjà nke àjà-udo imezu nkwa, ma-ọbu inye onyinye-afọ-ofufo, n'etiti ìgwè ehi ma-ọbu n'etiti ìgwè ewu na aruru, ihe zuru okè ka ọ gābu ibu ihe nātọ utọ: ọlu ọ bula agaghi-adi n'aru ya.

22 Ihe kpuru ìsì, ma-ọbu ihe kpajiri akpaji, ma-ọbu ihe emeruru aru, ma-ọbu ihe nwere ọnyá, ma-ọbu ihe àb͕à nāta, ma-ọbu ihe nwere ire-ebube, unu ewetala ndia nso Jehova, unu esite-kwa-la na ha chuara Jehova àjà-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Ya.

23 Oke-ehi ma-ọbu nwa-aturu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi, ma-ọbu nke kpọrọ ùkpọ̀, onyinye-afọ-ofufo ka i gēme ya; ma ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ bayere nkwa.

24 Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu.

25 Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

26 Jehova we gwa Moses okwu, si,

27 Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.

28 Ehi ma-ọbu aturu, unu eb͕ula ya na nwa-ya n'otù ubọchi.

29 Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà-ekele, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.

30 N'otù ubọchi ahu ka agēri ya; unu emela ka ihe fọdu nime ya rue ututu: Mu onwem bu Jehova.

31 Unu gēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova.

32 Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27