25 onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.
26 Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú.
27 Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi.
28 Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.
29 Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n'etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n'elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche,
30 na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana.
31 Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi.