1 Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú.
3 N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya.
4 Orú ubọchi na iri na atọ ka nwayi ahu gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha; ọ dighi ihe nsọ ọ bula ọ gēmetu aka, ọ gaghi-abà kwa n'ebe nsọ ahu, rue ozùzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha.
5 Ma ọ buru na ọ mua nwa-nwayi, ọ gāru kwa árú ízù ubọchi asa abua, dika n'idi-na-nsọ-ya; ọ bu kwa ọgu ubọchi atọ na isi ka ọ gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha