44 onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.
45 Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.
46 Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.
47 Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;
48 ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:
49 ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:
50 onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa: