19 Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n'idi-na-nsọ nke ọrurú-ya.
20 Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi.
21 Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.
22 Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu.
23 Gi na anumanu ọ bula edina-kwa-la ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi: nwayi agaghi-eguzo kwa n'iru anumanu iso ya dina; ngwakọta ọjọ ka ọ bu.
24 Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:
25 ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya.