21 ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n'aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n'aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso.
22 Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri.
23 Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.
24 Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.