6 N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe achicha ekoghi-eko gādi-kwa-ra Jehova: ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko.
7 N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
8 Ma unu gēweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova ubọchi asa: n'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.
9 Jehova we gwa Moses okwu, si,
10 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu bara n'ala nke Mu onwem nēnye unu, mb͕e unu gēwe kwa ihe-ubi-ya, unu gēweta-kwa-ra onye-nchu-àjà ùkwù nke ihe mbu nke owuwu-ihe-ubi-unu:
11 ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya.
12 N'ubọchi unu nēfé ùkwù ahu, unu gēme nwa-ebulu nke zuru okè nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.