46 Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù.
47 Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa:
48 mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya:
49 ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.
50 Ya na onye b͕aworo ya gāgu kwa site n'aro ọ were onwe-ya renye ya rue arọ jubile: ego orire-ya gādi kwa ka ọnu-ọgugu arọ; dika ubọchi nile nke onye egoro ọlu ka ọ gānọ n'aka-ya.
51 Ọ buru na ọtutu arọ fọduru, dika ha si di ka ọ gēsite n'ego orire-ya nyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.
52 Ma ọ buru na ole-na-ole fọduru n'arọ rue arọ jubile, ọ gāgu-kwa-ra ya; dika arọ-ya nile si di ka ọ gēnyeghachi ihe-nb͕aputa-ya.