4 Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n'isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n'iru Jehova.
5 Onye-nchu-àjà etere manu gēwere ufọdu nime ọbara oké-ehi, webata ya n'ulo-ikwū nzute:
6 onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu.
7 Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n'iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
8 Ọ gēsi kwa nime ya welie abuba nile nke oke-ehi nke àjà-nmehie; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,
9 na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya),
10 dika esi n'oké-ehi nke ihe àjà nke àjà-udo eweli ya: onye-nchu-àjà gēsure kwa ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.