32 Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n'ọku ka unu gēsure ya.
33 Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n'ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu.
34 Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.
35 Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.
36 Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.