Nehemaia 13:13-19 IGBOB

13 M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.

14 Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.

15 Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.

16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n'ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.

17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m'we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?

18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.

19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike.