Nehemaia 13:15-21 IGBOB

15 Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.

16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n'ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.

17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m'we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?

18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.

19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike.

20 Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n'azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua.

21 M'we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m'gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n'ubọchi-izu-ike.