6 Ayi we lua mb͕idi ahu; ewe lukọta mb͕idi nile rue nkera idi-elu-ya: n'ihi na ndi-Ju nwere obi ilu ọlu.
7 O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;
8 ha we kekọta onwe-ha, ha nile n'otù, ibia ibuso Jerusalem agha, na ikpatara ya ihe-njehie.
9 Ayi we kpere Chineke-ayi, guzo ndi-nche megide ha ehihie na abali, n'ihi ha.
10 Juda we si, Ike nke ndi-ibu ebilatawo, ma nkpọnkpọ-ihe riri nne; ayi onwe-ayi apughi kwa ilu mb͕idi.
11 Ndi nākpab͕u ayi we si, Ha agaghi-ama, ha agaghi-ahu kwa, rue mb͕e ayi batara n'etiti ha, b͕ue ha, me ka ije-ozi ahu kwusi.
12 O rue, mb͕e ndi-Ju ndi bi n'akuku ha biara, na ha siri ayi ub͕ò iri site n'ebe ahu nile, Unu gēchigharikute ayi.